Exodus 23:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ma n'arọ nke-asa i gārapu ya, me ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ka ndi-ob͕eye nke ndi-gi we rie ihe: anu-ọhia gēri kwa ihe ha rifọrọ. Otú a ka i gēme kwa ubi-vine-gi, me kwa ubi-olive-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.