Exodus 26:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha gābu ihe abua ejikọtara n'otù n'okpuru, ha abua gābu kwa otù ihe zuru okè rue isi-ya rue otù nb͕a-aka ahu: otú a ka ọ gādiri ha abua; nkuku abua ahu ka ha gādiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼisi nkuku abụọ ndị a, ha ga-anọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya, ma a ga-ejikọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka, ha abụọ ga-adị otu ahụ.