Exodus 28:38 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.