Exodus 29:14 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma anu oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na nsi-ya, i gēsure ya n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū-unu: àjà-nmehie ka ọ bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie.