Exodus 29:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke isisi ya dị ezi mma. Aja a chụrụ nye Onyenwe anyị site nʼọkụ.