Exodus 29:34 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ọ buru na ihe afọdu site n'anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n'achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n'ọku: agaghi-eri ya, n'ihi na nsọ ka ọ di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ụfọdụ nʼime anụ na achịcha ido nsọ ndị ahụ afọdụ ruo ụtụtụ, a ga-akpọ ha ọkụ. A gaghị eri ya ọzọ, nʼihi na ọ bụ ihe dị nsọ.