Exodus 29:36 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Oke-ehi nke àjà-nmehie ka i gāchu kwa bayere nkpuchi-nmehie kwa-ubọchi: i gēwepu kwa nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu mb͕e i nēkpuchi nmehie n'elu ya; i gēte kwa ya manu, ido ya nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ị ga-achụ aja oke ehi dịka aja mmehie maka ikpuchi mmehie kwa ụbọchị. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụ aja m dị ọcha, site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie nʼelu ya, na ite ya mmanụ nʼihi iji doo ya nsọ.