Exodus 29:37 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụbọchị asaa ka ị ga-edo ebe ịchụ aja nsọ site nʼịchụ aja mkpuchi mmehie. Mgbe ahụ ebe ịchụ aja ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ebe ịchụ aja ahụ ga-adị nsọ.