Exodus 29:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
I gēwere kwa ihe ike n'úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n'isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n'ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kekwasịkwa ha ihe okike nʼisi. Keekwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ihe ike nʼukwu. Mgbe ahụ ọrụ ndị nchụaja ga-abụ nke ha site nʼụkpụrụ ebighị ebi. “Nʼụzọ dị otu a ka ị ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ.