Exodus 3:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha gēge kwa nti n'olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘ Onyenwe anyị, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ Onyenwe anyị Chineke anyị aja.’