Exodus 30:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche Onyenwe anyị nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.”