Exodus 32:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we were nwa-ehi ahu nke ha mere, sure ya n'ọku, gwe ya rue mb͕e o mere irighiri, o we fesa ya n'elu miri, me ka umu Israel ṅua ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mosis weere nwa oke ehi ahụ ha kpụrụ akpụ, kpọọ ya ọkụ. Mgbe ahụ, o gweriri ya dịka ntụ. Fesaa ya nʼelu mmiri mee ka ụmụ Izrel ṅụọ mmiri ahụ.