Exodus 34:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ we si, Le, Mu onwem nāb͕a ndu: n'iru ndi-gi nile ka M'gālu oké ọlu di iche iche, bú nke ọ dighi mb͕e ekere ha n'uwa nile, ma-ọbu nime mba ọ bula: ndi nile ndi gi onwe-gi nọ n'etiti ha gāhu kwa ọlu Jehova, n'ihi na ihe-egwù ka ọ bu, bú nke Mu onwem nēme n'ebe i nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.