Exodus 34:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma nwa inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya: ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya. Ọkpara ọ bula n'etiti umu-gi ka i gāb͕aputa. Ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta. “O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye.