Exodus 34:22 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
I gēme-kwa-ra onwe-gi ememe nke izù asa nke ubọchi asa, bú nke nkpuru mbu nke obìbì ọka wheat, na ememe nke nchikọta-ihe n'ọb͕ub͕a arọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Mee Mmemme Izu Ụka asaa, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ọka wiiti mee, na Mmemme Nchịkọta Ihe nʼọgwụgwụ afọ ọbụla.