Exodus 34:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n'etiti ayi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n'ihe-nketa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”