Exodus 35:22 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we bia, ma ndikom ma ndinyom, onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ha we weta ihe-nkpọchi-uwe, na nb͕a-aka imi, na nb͕a-aka-akàrà, na ihe anēyi n'olu, ihe ọla-edo ọ bula; bú onye ọ bula nke fere àjà-ofufé ọla-edo nye Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile ọ metụrụ nʼobi, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị bịara weta onyinye ha. Ha wetaara Onyenwe anyị onyinye ihe ịchọ mma nke ọlaedo dị iche iche: ihe ịkpọchi uwe, ọlantị, ọlaaka na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma dị iche iche, nke e ji ọlaedo kpụọ. Ha chere ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.