Exodus 36:35 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O we me ákwà-nb͕ochi ahu nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ bu ọlu onye-ọ̀kà, o mere ya ka o yie cherubim.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.