Exodus 37:29 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O me-kwa-ra manu otite-manu ahu di nsọ, na ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ nke anāgwaghi agwa, bú nke eji uda utọ di iche iche me, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha mekwara mmanụ otite dị nsọ, na ezigbo ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke a na-agwaghị ihe; bụ ọrụ nke onye na-eme mmanụ isi ụtọ.