Exodus 38:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu bu ọlu onye-ọdudu-ákwà, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: orú cubit ka ogologo-ya di, idi-elu-ya nime obosara-ya di cubit ise, dika ákwà-ngechi nke ogige ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ bụ ihe e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee; akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ dị mita itoolu nʼogologo, yikwaa akwa mgbochi nke ebe ogige ahụ, dị mita abụọ na iri sentimita atọ nʼịdị elu.