Exodus 38:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a bụ ngwongwo niile e ji wuo ụlọ nzute ahụ; ebe a ga-edebe Ihe Ama ahụ. Ọ bụ ndị Livayị depụtara ihe niile ndị a nʼusoro dịka Mosis si nye ha nʼiwu. Ọ bụkwa Itama, nwa Erọn onye nchụaja, lekọtara ndị niile rụrụ ọrụ idekọta ya.