Exodus 39:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ihe-ọkiké ahu nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, o site-kwa-ra na ya, ọ di kwa ka ọlu aluru ya si di; ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; dika Jehova nyere Moses iwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.