Exodus 7:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jehova we si Moses, Si Eron, Were nkpa-n'aka-gi setipu aka-gi n'elu miri nile nke Ijipt, n'elu osimiri nile ha, na n'elu osimiri Nail nile ha, na n'elu ọdọ-miri nile ha, na n'elu ebe-nchikọta-miri-ha nile, ka ha we ghọ ọbara; ọbara gādi kwa n'ala Ijipt nile, ma n'ihe nke osisi ma n'ihe nke nkume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Gwa Erọn ka o setịpụ mkpanaka ya nʼelu mmiri niile dị nʼIjipt. Nke a metụtara osimiri ha niile, mmiri ntakịrị ha niile, ọdọ mmiri ha niile, na ebe niile ha na-echekọta mmiri. Ọbara ga-ejupụta ebe niile nʼIjipt, ite mmiri na ite aja na ite osisi niile.”