Exodus 8:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n'ulo-gi, na n'ime-ulo-ndina-gi, na n'elu ihe-ndina-gi, na n'ulo ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na n'ite-ọku-gi nile, na n'ihe-gi i ji agwọ achicha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Osimiri Naịl ga-ejupụta nʼawọ. Ha ga-abata nʼụlọeze gị na nʼime ọnụụlọ ndina gị, ma nʼelu ihe ndina gị, ma nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, ma nʼụlọ ndị gị niile, na nʼebe a na-esi nri, ma nʼime ihe e ji agwakọta ụtụ ọka.