Ezekiel 10:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'we hu, ma, le, nime mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi cherubim, ihe dika nkume sapphire, dika oyiyi oche-eze si di n'ile ya anya, ka ahuru n'elu ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị.