Ezekiel 10:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Cherubim we chilie nkù-ha, si n'ala bulie onwe-ha elu n'anyam mb͕e ha puru, wheel nile ha di kwa n'akuku ha: ha we guzo n'oghere nke ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova; ebube nke Chineke nke Israel di n'elu ha n'elu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ Onyenwe anyị, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha.