Ezekiel 11:7 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ndi-unu eb͕uru eb͕u ndi unu tọb͕ọworo n'etiti ya, ha onwe-ha bu anu, obodo nka bu kwa ite: ma unu ka M'gēme ka unu si nime ya puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.