Ezekiel 12:16 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma M'gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n'oké unwu, na n'ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n'etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”