Ezekiel 12:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nwa nke madu, n'etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.