Ezekiel 13:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gākwatu kwa mb͕idi ahu nke unu teworo nzu, M'gēme kwa ka ọ darue ala, ewe kpughepu ntọ-ala-ya: ọ gāda kwa, agēme kwa ka unu gwusia n'etiti ya; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.