Ezekiel 14:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi nka gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye ọ bula n'ulo Israel nke nēme ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya dika o si di, ya bu dika iba-uba nke arusi-ya nile si di;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, gwa ha okwu sị ha ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe onye Izrel ọbụla na-agbaso arụsị nʼobi ya, nke na-ekwekwa ka arụsị ndị a na-eduba ya na mmehie, bịakwutere onye amụma ịjụta ya ase, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza onye ahụ dịka o si dị, ya bụ dịka ịba ụba nke arụsị ya niile si dị.