Ezekiel 17:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ bughi nkpọrọgwu-ya nile ka ọ gēropu, bipu kwa nkpuru-ya, ka o we kpọnwua; ka akwukwọ ndu nile nke npute-ya we kpọnwua; ọ̀ gaghi-eji kwa ogwe-aka uku ma-ọbu ndi bara uba iropu ya site na nkpọrọgwu-ya nile?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya.