Ezekiel 18:30 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi nka ka M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Latanu, sinu na njehie nile unu chigharia; ajọ omume ewe ghara ighọrọ unu ihe-isu-ngọngọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ.