Ezekiel 20:28 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ