Ezekiel 20:39 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma unu onwe-unu, ulo Israel, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Jenu, fè, onye ọ bula arusi-ya nile, ma emesia unu aghaghi igem nti: ma unu agaghi-eji onyinye nile unu na arusi nile unu me ka aha nsọm ghara idi nsọ ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.