Ezekiel 20:40 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na n'ugwu nsọm, n'ugwu nke ebe di elu nke Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ebe ahu ka ulo Israel nile, ka ọ ra, gēfèm n'ala-ha: n'ebe ahu ka ihe-ha gātọm utọ, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gāchọ àjà-nbuli nile unu na nkpuru mbu nke ùtú nile unu, ha na ihe nsọ nile unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.