Ezekiel 20:47 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
si oké ọhia Negeb, Nuru okwu Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje isuye ọku nime gi, ọ gēripia kwa osisi ndu nile ọ bula na osisi nile ọ bula kpọrọ nku nke di nime gi: ire-ọku-ya nēnwu enwu, ọ gaghi-anyu anyu, ọ gāru kwa iru nile site na Negeb rue na Ugwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile.