Ezekiel 20:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'rọputara Israel, M'we weliere nkpuru ulo Jekob akam, me ka ha maram n'ala Ijipt, M'we weliere ha akam, si, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”