Ezekiel 20:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we nupu isi n'okpurum, ha ekweghi kwa igem nti; ha etufughi, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, ha arapughi kwa arusi nile nke Ijipt: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'etiti ala Ijipt.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt.