Ezekiel 21:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na unu emewo ka echeta ajọ omume unu, nime nkpughe njehie nile unu, ewe hu nmehie nile unu n'omume nile unu; n'ihi na emewo ka echeta unu, ọ bu n'ọbu-aka ka agējide unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.