Ezekiel 21:28 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, si, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere umu Amon, baye-kwa-ra ita-uta-ha, si; gi si kwa, Le, mma-agha, bú mma-agha nke amiputaworo, n'ihi ob͕ub͕u ka emere ya ka ọ nēb͕u maramara, otú ọ gēkwe ya inagide, ka o we di ka àmùmà:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “ ‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.