Ezekiel 22:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ọbara-gi, bú nke i wusiworo, ka ikpe maworo gi, ọ bu kwa n'arusi-gi nile, bú nke i meworo, ka i ruru árú; i we me ubọchi-gi ka ha biarue nso, i we biarue ọgwugwu arọ-gi nile: n'ihi nka ka M'meworo gi ka i ghọrọ mba nile ihe-ita-uta, ka i ghọ-kwa-ra ala nile ihe-ọchì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche.