Ezekiel 23:37 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na ha akwawo iko, ọbara di kwa n'aka-ha, ọ bu kwa arusi nile ha ka ha kwasoworo iko; ọzọ kwa, umu-ha ndikom, bú ndi ha mutaram, ka ha mere ka ha gabigara ha ọku, ka o we ripia ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ha akwaala iko, ọbara jupụtakwara nʼaka ha, ha na arụsị ha kwakwara iko. Ha jikwa ọ bụladị ụmụ nke ha mụtaara m chụọ aja nsure ọkụ nye ha.