Ezekiel 23:40 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọzọ kwa, unu nēziga ikpọ ndikom ndi nēsi n'ebe di anya bia: bú ndi ezigaworo onye-ozi, ma, le, ha biara; ndi i sara aru n'ihi ha, de ihe n'anya-gi abua, chiri ihe-ichọ-nma chọ onwe-gi nma,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị.