Ezekiel 27:24 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi ahu bu ndi-ahia-gi n'ihe di iche iche mazuru nma, n'ulo ákwà anunu na ákwà akpara nke-ọma, na n'ib͕e juputara n'uwe turu agwa nke-ọma, nke eji udọ̀ ke were kwa osisi cedar me ha, n'etiti ihe-ahia-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị.