Ezekiel 28:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Site n'iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ajọ omume nke ọzuzu-ahia-gi, ka i meworo ebe nsọ gi ka ha ghara idi nsọ: M'we me ka ọku si n'etiti gi puta, nke ahu eripiawo gi, M'we me ka i ghọ ntu n'elu ala n'anya ndi nile nāhu gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị, i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ. Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta, repịa gị. Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala, nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.