Ezekiel 28:26 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha gēbi n'elu ya na ntukwasi-obi; ha gēwu kwa ulo, kua ubi-vine, biri na ntukwasi-obi; mb͕e M'mesiri ihe nile ekpere n'ikpe n'aru ndi nile nēlelì ha n'ebe nile di ha buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”