Ezekiel 29:18 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.