Ezekiel 30:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ubọchi ahu ndi-ozi gēsi n'irum pua je n'ub͕ọ di iche iche ime ka Etiopia ma jijiji, bú ndi nọ na ntukwasi-obi; ihe-nb͕ali gādi kwa n'aru ha, dika n'ubọchi Ijipt, n'ihi na, le, ọ nābia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.