Ezekiel 31:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n'elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n'ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.